Habakkuk 1

1Nke a bụ ozi Habakuk onye amụma natara.

Mkpesa Habakuk

2 Onyenwe anyị, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpu
ma ị dịghị ege ntị?
Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku gị na-asị, “Ihe ike, ihe ike!”
ma ị dịghị azọpụta?
3Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ?
Gịnị mere i ji anagide mmegbu?
Mbibi na ihe ike dị nʼihu m,
na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile.
4Nʼihi ya, iwu na-ada mba,
ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu.
Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu,
nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ.

Ọsịsa Onyenwe anyị

5“Legide mba niile anya, ka i hụ.
Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu.
Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu,
nke unu na-agaghị ekwenye,
ọ bụladị ma akọọrọ unu ya.
6Nʼihi na lee, agaje m ime ka ndị Kaldịa bilie,
bụ mba ahụ na-adịghị eme ebere, na ndị na-eme ngwangwa.
Ha bụ ndị na-ebu agha na-ejegharị na mba niile,
ndị na-esite nʼaka ike na-enweta ebe obibi nke na-abụghị nke ha.
7Ha bụ mba a na-atụ ụjọ, na ndị dịkwa egwu.
Ha bụ iwu nye onwe ha, ihe ha tụpụtara ka ha na-eme.
Ọ bụ onwe ha ka ha na-ebuli elu.
8Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ.
Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị.
Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ,
ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa.
Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri.
9Ha niile na-abịa ime ihe ike.
Ha ji ọsọ na-abịa dịka oke ifufe nke ọzara.
Ha na-abịa ịchịkọta ndị a dọtara nʼagha dịka ha bụ uzuzu.
10Ha na-akwa ndị eze emo,
jirikwa ndịisi ọchịchị na-eme ihe ọchị.
Ha na-achị ebe niile e wusiri ike ọchị,
na-ekpokọtakwa aja nʼazụ mgbidi niile ịlụta ha nʼagha.
11Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwa
ndị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.”

Mkpesa Habakuk nke ugboro abụọ

12 Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi?
Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ.
Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe.
Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ.
13Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya;
ị naghị anabatakwa mmegbu.
Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị?
Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda
ndị bụ ndị ezi omume karịa ha?
14I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri,
e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha.
15Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha.
Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha.
Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya,
si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ.
16Nʼihi nke a, ọ na-achụ aja
na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya,
nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ,
na-erikwa nri kachasị mma
17Ọ ga-aga nʼihu mgbe niile na-awụpụ ihe o ji ụgbụ ya gbute
na-ala mba niile nʼiyi, dịka o si masị ya, na-egosighị obi ebere ọbụla?
Copyright information for IboBIU